Revelation 11:5 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
A ga-eme ka onye ọ bụla ga-achọ imejọ ha nwụọ. Ọ bụ ọkụ si ha nꞌọnụ pụta ka ha ga-eji rechapụ ndị dị otu a.
Igbo 2006
Ọ buru kwa na onye ọ bula chọrọ imejọ ha, ọku nēsi n'ọnu-ha puta, nēripia kwa ndi-iro-ha; ọ buru kwa na onye ọ bula gāchọ imejọ ha, aghaghi ib͕u ya otú a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imerụ ha ahụ, ọkụ ga-esi ha nʼọnụ pụta rechapụ ndị iro ha. Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imerụ ha ahụ, a ga-egbu ya nʼụzọ dị otu a.