Revelation 11:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌọgwụgwụ afọ atọ na ọkara ahụ, mgbe ha rụsịrị ọrụ ịgba ama ha, onye nduhie ahụ, nke ga-esite nꞌime olulu ahụ na-enweghị nsọtụ pụta, ga-ebuso ha agha merie ha, gbuokwa ha.
Igbo 2006
Ma mb͕e ọ bula ha gāb͕azuwo àmà-ha, anu-ọhia ahu nke nēsi n'abyss ahu rigoputa gēbu agha megide ha, meri kwa ha, b͕u kwa ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ha gbazuru ama ha, anụ ọhịa ahụ, nke na-esite nʼime olulu Abis ahụ ga-ebuso ha agha merie ha, gbukwaa ha.