Revelation 11:8 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ha nwụchara, ozu ha ga-atọgbọ nꞌala, nꞌokporo ụzọ dị na Jerusalem ụbọchị atọ na ọkara. Ee, ozu ha ga-atọgbọ nꞌokporo ụzọ Jerusalem, obodo ahụ e kwuru ihe banyere ya sị na ọ bụ obodo Sodọm, na obodo a kpọkwara Ijipti. Nke a bụ obodo ahụ ebe a kpọgidere Onyenwe ha nꞌobe.
Igbo 2006
Ozu-ha we di n'amá nke obodo uku ahu, bú nke anākpọ Sọdọm na Ijipt n'uzọ nke Mọ Nsọ, ebe akpọgide-kwa-ra Onye-nwe-ha n'obe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ha nwụchara, ozu ha ga-atọgbọrọ nʼokporoụzọ nke obodo ukwu ahụ nke a na-akpọ na mmụọ Sọdọm na Ijipt, ebe a kpọgburu Onyenwe ha nʼobe.