Revelation 12:3 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Na mberede, agwọ ochie ahụ a na-akpọ Dragọn nꞌasụsụ bekee pụtara ìhè. O nwere isi asaa na mpi iri. O kpukwasịkwara okpu eze asaa nꞌisi ya.
Igbo 2006
Ewe hu ihe-iriba-ama ọzọ n'elu-igwe; ma le, oké dragon nke nācha ọku ọku, nke nwere isi asa na mpi iri, nēkpu kwa okpu-eze asa n'isi-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, ihe ama ọzọ pụtara ihe nʼeluigwe, agwọ ochie nke dị ukwuu na-acha uhie uhie a na-akpọ dragọn, nke nwere isi asaa na mpi iri. O kpukwasịkwara okpueze asaa nʼisi ya.