Revelation 12:4 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌazụ ya, o nwere ọdụdụ nke o ji dọkpụrụ otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ nke kpakpando nile dị nꞌeluigwe, tụda ha nꞌala. Ọ bịara guzo nꞌihu nwanyị ahụ mgbe ọ na-achọ ịmụpụta nwa ahụ ọ dị ime ya, nọọ na njikere iri nwantakịrị ahụ nwanyị ahụ ga-amụpụta.
Igbo 2006
Ọdudù-ya nādọrọ kwa otù uzọ n'uzọ atọ nke kpakpando nke elu-igwe, o we tudà ha n'ala: dragon ahu we guzo n'iru nwanyi ahu onye gaje imuputa nwa, ka o we ripia Nwa-ya mb͕e ọ bula ọ gāmuputa Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O nwere ọdụdụ nke o ji dọkpụrụ otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke kpakpando niile dị nʼeluigwe, tụda ha nʼala. Ọ bịara guzo nʼihu nwanyị ahụ na-achọ ịmụpụta nwa ahụ ọ dị ime ya, nọọ na njikere iri nwantakịrị ahụ ma a mụpụta ya.