Revelation 13:11 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m anụ ọhia ọzọ dị iche nke nwere mpi nta abụọ dị ka mpi Nwa atụrụ ahụ. Kama olu ya yiri olu agwọ ochie ahụ. Ọ bụ anụ ọhia na-eme ka ụjọ tụọ ndị lekwasịrị ya anya. O sikwa nꞌime ala pụta.
Igbo 2006
M'we hu anu-ọhia ọzọ ka ọ nēsi n'ala rigoputa; o nwe-kwa-ra mpi abua yiri nke Nwa-aturu ahu, ma ọ nēkwu okwu dika dragon ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m anụ ọhịa ọzọ dị iche ka o si nʼala na-arịpụta. O nwere mpi nta abụọ dịka mpi Nwa atụrụ, kama ọ na-ekwu okwu dịka agwọ ochie ahụ.