Revelation 13:12 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
E nyere ya ike ịchị isi nke anụ ọhia ahụ ọnya dị nꞌotu isi ya nwere. Ọ bụkwa ike a ka o ji kwagịde ndị nile bi nꞌụwa ka ha kpọọ isi ala nye anụ ọhia ahụ.
Igbo 2006
O we nāchi isi nile nke anu-ọhia mbu ahu n'iru ya. Ọ nēme kwa uwa na ndi bi nime ya ka ha kpọ isi ala nye anu-ọhia mbu ahu, nke emere ka ihe-otiti-ya nke nēweta ọnwu la.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ na-achị isi nʼọnọdụ anụ ọhịa nke mbụ. Ọ bụkwa ike a ka o ji kwagide ụwa na ndị niile bi nʼime ya ka ha kpọọ isiala nye anụ ọhịa mbụ ahụ nke a gwọrọ ọnya ya na-eweta ọnwụ.