Revelation 13:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ na-arụ ọrụ ịtụnanya a mgbe ọ bụla anụ ọhia nke mbụ nọ na-ele ya anya. Ọ na-arụkwa ọrụ ndị a iji ya iduhie mmadụ nile nọ nꞌebe nile. O nyekwara iwu ka ndị nile bi nꞌụwa kpụọ ihe yiri anụ ọhia nke mbụ ahụ nwere ọnya gaara ewetara ya ọnwụ nꞌotu isi ya, bụ anụ ọhia e mekwara ka ọnya ya laa.
Igbo 2006
O we nēduhie ndi bi n'elu uwa n'ihi ihe-iriba-ama nile nke enyere ya ike ime n'iru anu-ọhia ahu; nāsi ndi bi n'elu uwa, ka ha kpuara anu-ọhia ahu ihe-oyiyi, bú nke nwere ob͕ub͕u-mma-agha ahu, we di ndu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O duhiekwara ndị mmadụ bi nʼụwa site nʼọrụ ịrịbama ya niile nke e nyere ya ike ịrụ nʼọnọdụ anụ ọhịa ahụ. Ọ gwakwara ndị niile bi nʼụwa ka ha kpụọ ihe oyiyi nke anụ ọhịa ahụ nke e jiri mma agha merụchaa ahụ, ma mechaa dị ndụ.