Revelation 13:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
E nyere anụ ọhia nke abụọ a ike ikunye ume ndụ nꞌime ihe ahụ a kpụrụ akpụ. E nyekwara ya ike ime ka o kwuo okwu. Mgbe a kpụsịrị ihe ahụ kunye ya ume ndụ, ihe a a kpụrụ akpụ nyere iwu ka e gbuo onye ọ bụla jụrụ ife ya onwe ya ofufe.
Igbo 2006
Ewe nye ya ike inye ya ume, bú ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu, ka ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu we kwue okwu, me kwa ka eb͕ue ha, ka ha ra, bú ndi ọ bula nākpọghi isi ala nye ihe-oyiyi nke anu-ọhia ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
E nyere ya ike ikunye ume ndụ nʼime oyiyi nke anụ ọhịa mbụ ahụ, ime ka ihe a kpụrụ akpụ kwuo okwu mekwa ka e gbuo ndị niile na-akpọghị isiala nye ya.