Revelation 13:18 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ihe dị nꞌebe a chọrọ ka e jiri amamihe nyochaa ya. Ka onye ọ bụla nwere ọgụgụ isi jiri uche ya sụgharịa ihe ọnụ ọgụgụ a pụtara. Nꞌihi na ọnụ ọgụgụ a nọchiri anya aha otu onye. Ihe ọnụ ọgụgụ ahụ nọchikwara aha ya bụ narị isii na iri isii na isii, ya bụ 666.
Igbo 2006
N'ebe a ka amam-ihe di. Onye nwere uche, ya gua ọnu-ọgugu nke anu-ọhia ahu; n'ihi na ọ bu ọnu-ọgugu madu: ọnu-ọgugu-ya bu kwa nnù na ọgu iri na ọgu atọ na isi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nke a ka chọrọ amamihe maka ịghọta ya. Ka onye ọbụla nwere ọgụgụisi, gụọ ọnụọgụgụ nke anụ ọhịa ahụ, nʼihi na ọ bụ ọnụọgụgụ mmadụ. Ọnụọgụgụ ahụ bụkwa narị isi na iri isi na isii, ya bụ 666.