Revelation 13:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mmadụ nile kpọrọ isi ala nye ya, bụ ndị ahụ a na-edeghị aha ha nꞌakwụkwọ nke ndụ Nwa atụrụ ahụ, onye Chineke mere site na ntọ ala nke ụwa ka ọ bụrụ onye a ga-akpọgbu.
Igbo 2006
Ndi nile ndi bi n'elu uwa gākpọ kwa isi ala nye ya, onye ọ bula anēdeghi aha-ya n'akwukwọ nke ndu nke Nwa-aturu ahu Onye eb͕uworo site n'oge itọ ntọ-ala nke uwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị niile bi nʼelu ụwa ga-akpọkwa isiala nye ya, bụ onye ọbụla a na-edeghị aha ya nʼime akwụkwọ nke ndụ nke Nwa atụrụ ahụ e gbururị, site nʼoge e kere ụwa.