Revelation 14:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ elere m anya hụ Nwa atụrụ ahụ ka o guzo nꞌugwu Zayọn nke dị na Jerusalem. Ya na narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ahụ, bụ ndị e dekwasịrị aha Nwa atụrụ ahụ na aha Nna ya nꞌegedege ihu ha.
Igbo 2006
M'we hu, ma le, Nwa-aturu ahu ka Ọ nēguzo n'ugwu Zaion, Ya na ọgu nnù iri na ọgu nnù asatọ, bú ndi edeworo aha-Ya na aha Nna-Ya n'egedege-iru-ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Elere m anya hụ Nwa Atụrụ ahụ ka o guzo nʼugwu Zayọn. Ya na narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ahụ, bụ ndị e dekwasịrị aha ya na aha Nna ya nʼegedege ihu ha.