Revelation 14:10 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
aghaghị isoro ṅụọ ihe si nꞌiko iwe Chineke. Iwe Chineke ahụ ka a ga-awụnyekwa, na-agwaghị agwa, nꞌime iko ọnụma Chineke. A ga-ejikwa ọkụ na nkume ọkụ mekpaa ha ahụ nꞌihu ndị mmụọ ozi dị nsọ na nꞌihu Nwa atụrụ ahụ.
Igbo 2006
ya onwe-ya gāṅu kwa nime manya nke ọnuma Chineke, nke edoziworo nāgwaghi-agwa nime iko nke iwe-Ya; agēji kwa ọku na brimstone mekpa ya aru n'iru ndi-mọ-ozi di nsọ, na n'iru Nwa-aturu ahu:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ha onwe ha, aghaghị isoro ṅụọ mmanya nke oke iwe Chineke, bụ nke a na-agwaghị agwa gbanye nʼime iko ọnụma ya. A ga-ejikwa ọkụ na nkume ọkụ mekpaa ha ahụ nʼihu ndị mmụọ ozi dị nsọ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ.