Revelation 14:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Anwụrụ ọkụ si nꞌebe a na-emekpa ha ahụ apụta na-arigo elu ruo mgbe nile ebighị ebi. Izuike agaghị adịrị ha ehihie na abalị nꞌihi na ha kpọrọ isi ala nye anụ ọhia ahụ na oyiyi ya a kpụrụ akpụ, kwerekwa ka a kakwasị ha akara nke ọnụ ọgụgụ ya.
Igbo 2006
anwuru-ọku nke nmekpa-aru-ha nārigo rue mb͕e nile ebighi-ebi; ha adighi-ezu kwa ike ehihie na abali, bú ndi nākpọ isi ala nye anu-ọhia ahu na ihe-oyiyi-ya, ma ọ buru kwa na onye ọ bula anata akàrà nke aha-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anwụrụ ọkụ si nʼebe a na-emekpa ha ahụ apụta na-arịgo elu ruo mgbe niile ebighị ebi. Izuike agaghị adịrị ha ehihie na abalị bụ ndị ahụ kpọrọ isiala nye anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya a kpụrụ akpụ, kwerekwa ka a kakwasị ha akara nke aha ya.