Revelation 14:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Anụkwara m olu nke si nꞌeluigwe daa gwa m okwu sị, dee ihe a nꞌakwụkwọ, “Oge eruola mgbe ndị nile e gburu nꞌihi okwu Chineke ga-anatazu ụgwọ ọrụ ha zuru oke. Nꞌezie, Mmụọ Nsọ na-ekwu na ha bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na ugbu a ha ga-ezu ike site nꞌọrụ ha nile na ahụhụ ha nile, nꞌihi na ezi ọrụ ha rụrụ ga-eso ha baa nꞌeluigwe.”
Igbo 2006
M'we nu olu ka ọ nēsi n'elu-igwe da, si, De akwukwọ, Ngọzi nādiri ndi nwuru anwu, bú ndi gānwu anwu nime Onye-nwe-ayi site n'ub͕u a: e, ka Mọ Nsọ nēkwu, ka ha we si na ndọb͕u nile ha dọb͕uru onwe-ha n'ọlu zuru ike; n'ihi na ọlu nile ha nēso ha ga.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anụkwara m olu nke si nʼeluigwe daa na-asị, dee ihe a nʼakwụkwọ, “Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị nwụrụ nʼime Onyenwe anyị site ugbu a gaa nʼihu.” “E, ha ga-ezu ike site na ndọgbu niile nke ha dọgburu onwe ha, nʼihi na ọrụ ha rụrụ ga-eso ha,” ka Mmụọ Nsọ na-ekwu.