Revelation 14:18 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Otu mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ e nyere ike iji ọkụ mebie ụwa tikuru mmụọ ozi ahụ ji mma owuwe ihe ubi dị nkọ sị ya, “Were mma owuwe ihe ubi gị bipụ ụyọkọ osisi oroma nile dị nꞌụwa, nꞌihi na ha nile achaala ikpe ikpe.”
Igbo 2006
Mọ-ozi ọzọ we si n'ebe-ichu-àjà ahu puta, bú onye nwere ike n'ebe ọku ahu di; o we were oké olu tiere onye ahu nke nwere mma-iwe-ihe-ubi di nkọ nkpu, si, Tiye mma-iwe-ihe-ubi-gi di nkọ, bipu uyọkọ nile nke vine nke uwa; n'ihi na nkpuru-vine-ya achazuwo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mmụọ ozi ọzọ, nke na-elekọta ọkụ sitekwara nʼebe ịchụ aja ahụ pụta, were olu ike gwa mmụọ ozi ahụ ji mma dị nkọ sị, “Were mma owuwe ihe ubi gị dị nkọ bipụ osisi ụyọkọ mkpụrụ grepu site na vaịnị niile dị nʼụwa, nʼihi na ha niile achaala.”