Revelation 14:2 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Anụkwara m olu si nꞌeluigwe na-ada. Olu a na-ada ụda dị ka ụda mmiri si nꞌime nkume na-asọpụta, ma ọ bụ dị ka ụda nke oke egbe eluigwe. Olu a bụ olu ndị na-abụ abụ, ndị ji ụbọ akwara na-abụ abụ.
Igbo 2006
M'we nu olu ka ọ nēsi n'elu-igwe dà, dika olu ọtutu miri, di kwa ka olu oke éb͕è-elu-igwe: olu ahu m'nuru di kwa ka olu ndi nākpọ ubọ-akwara mb͕e ha nēwere ubọ-akwara-ha nākpọ:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anụkwara m olu si nʼeluigwe na-ada dịka ụda mmiri si nʼime nkume na-asọpụta, maọbụ dịka ụda nke oke egbe eluigwe. Olu m nụrụ dịka olu ndị na-abụ abụ, ndị ji ụbọ akwara na-abụ abụ.