Revelation 14:20 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
A zọchakwara mkpụrụ ndị a nꞌime mbadamba ala a na-anọ azọcha oroma nke dị nꞌazụ obodo. Ọbara sitere nꞌebe ahụ sọọ dị ka idee mmiri, ruo ihe dị ka narị kilomita atọ. Ịla elu nke ọbara a, ya bụ omimi ya, dịkwa ka site nꞌala ruo nꞌọnụ inyinya.
Igbo 2006
Ewe zọcha ebe-nzọcha-nkpuru-vine ahu n'azu obodo ahu, ọbara we si n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine ahu puta, rue bridle inyinya, ru kwa ihe ra ka nnù furlong anọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
A zọchakwara mkpụrụ vaịnị ahụ nʼebe a na-azọcha mkpụrụ vaịnị nke dị nʼazụ obodo. Ọbara si nʼebe ahụ gbapụta dị elu ruo ihe dịka eriri e ji ekegide ịnyịnya nʼisi ime ka ọ gaa ebe achọrọ, ọ bụ ihe ruru narị kilomita atọ nʼogologo.