Revelation 14:4 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị a bụkwa ndị na-emerụghị onwe ha nꞌebe ụmụ nwanyị dị, ndị dị nsọ nꞌime mmụọ ha dị ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Ha na-eso Nwa atụrụ ahụ na-aga ebe ọ bụla ọ na-aga. Ha bụ ndị e si nꞌetiti ndị mmadụ bi nꞌụwa gbapụta, ka ha bụrụ onyinye e doro iche nye Chineke na Nwa atụrụ ahụ.
Igbo 2006
Ndia bu ndi nēmerughi onwe-ha n'aru ndinyom; n'ihi na ha di ọcha ka umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Ndia bu ndi nēso Nwa-aturu ahu ebe ọ bula Ọ nēje. Ndia ka ab͕atara n'etiti madu, iburu Chineke na Nwa-aturu ahu nkpuru mbu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị a bụkwa ndị na-emerụghị onwe ha nʼebe ụmụ nwanyị dị, nʼihi na ha dị ọcha ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Ha na-eso Nwa Atụrụ ahụ ebe ọbụla ọ na-aga. Ha bụ ndị a gbapụtara nʼetiti mmadụ ịbụrụ Chineke na Nwa Atụrụ ahụ dịka mkpụrụ mbụ.