Revelation 14:8 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ mmụọ ozi ọzọ bịara soro ya, na-efegharị na-asị, “Obodo ukwu ahụ bụ Babilọn adaala, lee, ọ daala, nꞌihi na o meela ka mba nile soro ya ṅụrụ mmanya nke ọnụma na ịkwa iko ya na mmehie ya.”
Igbo 2006
Mọ-ozi ọzọ, bú nke-abua, we so, si, Ọ dawo, ọ dawo, bú Babilon uku ahu, nke meworo ka mba nile ṅua nime manya nke ọnuma nke ikwa-iko-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ mmụọ ozi nke abụọ bịara soro ya, na-efegharị na-asị, “ ‘Ọ daala! Ọ daala, bụ Babilọn obodo ukwu ahụ,’ bụ nke mere ka mba niile ṅụọ mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya.”