Revelation 15:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ahụkwara m ihe ịrịba ama ọzọ nke mere nꞌeluigwe. Ọ dị ebube dịkwa oke egwu. Ọ na-ezipụta ihe gaje ịbịa. Ọ bụ ndị mmụọ ozi asaa ka a họpụtara iburu ihe otiti asaa nke ikpeazụ na-abịakwasị ụwa. Mgbe a wụkwasịrị ụwa ihe otiti asaa ndị a, mgbe ahụ ka iwe Chineke ga-ajụrụ.
Igbo 2006
M'we hu ihe-iriba-ama ọzọ n'elu-igwe, nke di uku di kwa ebube, ndi-mọ-ozi asa ndi nwere ihe-ọtiti asa, nke bu nke-ikpe-azu, n'ihi na nime ha ka ọnuma Chineke gwuru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ahụkwara m ihe ịrịbama ọzọ nʼeluigwe. Ọ dị ebube dịkwa oke egwu. Ndị mmụọ ozi asaa ji ụzọ ahụhụ asaa. Ha bụ ahụhụ nke ikpeazụ ndị ga-eweta iwe Chineke na ngwụcha.