Revelation 15:2 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ala dị nꞌihu m dị ka ebe a tụsara enyo a gwakọtara ya na ọkụ. Nꞌelu ya ka ha nile guzo, bụ ndị nile meriri anụ ọhịa ọjọọ ahụ na oyiyi ya a kpụrụ akpụ, na akàra ya na ọnụ ọgụgụ ya. Ha nile ji ụbọ akwara Chineke.
Igbo 2006
M'we hu dika agāsi na ọ bu oké osimiri eji enyo me nke agwakọworo ya na ọku; ahu-kwa-ram ndi nāputa n'aka anu-ọhia ahu na nmeri, ya na n'aka ihe-oyiyi-ya, na n'aka ọnu-ọgugu aha-ya, ka ha nēguzo n'usọ oké osimiri ahu eji enyo me, nēnwe ubọ-akwara nke Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ahụrụ m ihe dịka oke osimiri enyo a gwakọtara ya na ọkụ, na ndị ahụ nweterala mmeri nʼebe anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya, na ọnụọgụgụ aha ya. Ha guzo nʼakụkụ oke osimiri enyo ahụ, jidekwa ụbọ akwara nke Chineke nʼaka ha.