Revelation 15:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mmụọ ozi asaa ndị ahụ e nyere ike ịwụkwasị ụwa ihe otiti asaa ahụ sitere nꞌụlọ nsọ ahụ pụta. Ha yi uwe dị nnọọ ọcha, nke na-enweghị ntụpọ. Ha jikwa akpụkpọ dị warara e ji ọlaedo mee kee gburugburu obi ha.
Igbo 2006
ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere ihe-otiti asa ahu we si n'ulo nsọ ahu puta, eb͕okwasiworo ha linen, nke di ọcha nēnwu kwa enwu, ekewo kwa ha ihe-ọkiké ọla-edo n'obi gburugburu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mmụọ ozi asaa ndị ahụ ji ihe ntaramahụhụ asaa sị nʼụlọnsọ ahụ pụta. Ha yi uwe ogho ọcha, akwa ọcha na-enwu ezigbo ọcha. E kekwasịrị ihe okike ọlaedo gburugburu obi ha.