Revelation 15:8 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ ụlọ nsọ ahụ jupụtara nꞌanwụrụ ọkụ si nꞌebube na ike Chineke na-apụta. Mmadụ ọ bụla enwekwaghị ike banye nꞌime ụlọ nsọ ukwu ahụ tutuu ruo mgbe mmụọ ozi asaa ndị ahụ wụsara ihe otiti asaa ahụ.
Igbo 2006
Ulo nsọ ahu we juputa n'anwuru-ọku nke si n'ebube Chineke puta, si kwa n'ike-Ya puta; ọ dighi kwa onye ọ bula puru ibà nime ulo nsọ ahu, rue mb͕e ihe-otiti asa ahu nke ndi-mọ-ozi asa ahu gāgwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ ụlọnsọ ahụ jupụtara nʼanwụrụ ọkụ si nʼebube na ike Chineke na-apụta. O nweghị onye ọbụla nwere ike ịba nʼụlọnsọ ahụ tutu ruo mgbe ntaramahụhụ asaa nke ndị mmụọ ozi asaa ahụ gwụchara.