Revelation 16:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ kwa, ahụrụ mmụọ ọjọọ atọ ndị pụtara ìhè nꞌọdịdị awọ. Ha si nꞌọnụ agwọ ochie ahụ na nꞌọnụ anụ ọhịa ahụ nwere ike ịrụ ọrụ ịtụnanya pụta.
Igbo 2006
M'we hu ndi-mọ atọ nādighi ọcha, dika awọ̀, ka ha nēsi n'ọnu dragon ahu, si kwa n'ọnu anu-ọhia ahu, si kwa n'ọnu onye-amuma ugha ahu, puta:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ahụrụ mmụọ atọ rụrụ arụ ndị pụtara ihe nʼụdịdị awọ, ha si nʼọnụ agwọ ochie ahụ na nʼọnụ anụ ọhịa ahụ nwere ike ịrụ ọrụ ịtụnanya pụta, na nʼọnụ onye amụma ụgha ahụ.