Revelation 16:15 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Lezie anya! Ana m abịa dị ka onye ohi! Ọṅụ dịrị ndị nile nọ na-eche maka ọbịbịa m, ndị na-edebe uwe ha na njikere, ndị na-agaghị ejegharị nꞌọṅọdụ ịgba ọtọ, nke na-eweta ihere.”
Igbo 2006
(Le, anamabia dika onye-ori. Ngọzi nādiri onye nēche nche, nēdebe kwa uwe-ya, ka ọ ghara ijeghari n'ọtọ, ha we hu ihere-ya.)
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Lee! Ana m abịa dịka onye ohi. Ngọzị na-adịrị onye ahụ nọ na-eche nche, ndị yi uwe ha na njikere, ka ọ ghara ijegharị nʼọnọdụ ịgba ọtọ, bụrụ onye ọnọdụ ya na-eweta ihere.”