Revelation 16:17 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ kwa, mmụọ ozi nke asaa wụpụrụ ihe dị nꞌefere nke ya nꞌikuku. Mgbe ọ wụpụrụ ya, otu olu sitere nꞌocheeze dị nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ daa ụda sị, “E mezuola ya!”
Igbo 2006
Mọ-ozi nke-asa we wusi ọkwa-ya n'elu mbara-elu-igwe; oké olu we si n'ulo nsọ ahu daputa, si n'ebe oche-eze ahu di, nāsi, Emewo ya:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mmụọ ozi nke asaa wụpụrụ ihe dị nʼefere nke ya nʼikuku, otu olu sitere nʼocheeze dị nʼụlọnsọ ukwu ahụ daa ụda sị, “Emezuola ya!”