Revelation 16:19 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Obodo ahụ bụ Babilọn kewara ụzọ atọ. Obodo ukwu nile dị nꞌụwa dara. Mgbe ahụ Chineke chetara obodo ukwu ahụ bụ Babilọn. O mere ka ọ ṅụrụ site nꞌihe dị nꞌiko ọnụma nke oke iwe ya.
Igbo 2006
Ewe kewa obodo uku ahu uzọ atọ, obodo nile nke mba nile we da: ewe cheta Babilon uku ahu n'iru Chineke, inye ya iko nke manya nke ọnuma nke iwe-Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Obodo ukwu ahụ kewara ụzọ atọ. Obodo niile dị na mba niile dakwara. Chineke chetara obodo ukwu ahụ bụ Babilọn. O nyere ya iko jupụtara na mmanya nke nʼoke iwe nke ọnụma ya.