Revelation 16:2 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mmụọ ozi nke mbụ hapụrụ ụlọ nsọ ahụ gaa wụsa ihe dị nꞌefere nke ya nꞌelu ụwa. Mgbe ọ wụsara ya, ọnya ọjọọ na-egbu oke mgbu bịakwasịrị ndị nile bi nꞌụwa, bụ ndị a kakwasịrị akara anụ ọhịa ahụ, na nꞌelu ndị na-akpọrọ oyiyi ya isi ala.
Igbo 2006
Mọ-ozi mbu we je, wusi ọkwa-ya nime uwa; ajọ ọnyá jọb͕uru onwe-ya we puta n'aru madu nile ndi nwere akàrà anu-ọhia ahu, ndi nākpọ kwa isi ala nye ihe-oyiyi-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mmụọ ozi nke mbụ pụrụ gaa wụsa ihe dị nʼefere nke ya nʼelu ụwa, ọnya ọjọọ na-egbu oke mgbu bịakwasịrị mmadụ niile nwere akara anụ ọhịa ahụ, na ndị na-akpọrọ oyiyi ya isiala.