Revelation 16:21 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mkpụrụ mmiri nke ịdị arọ otu nꞌime ha ruru iri kilogram ise, sitere nꞌeluigwe na-adakwasị ndị mmadụ. Nke a mekwara ka ha kọchaa Chineke nꞌihi ihe otiti mkpụrụ mmiri ahụ, nꞌihi na ihe otiti ahụ dị nnọọ njọ nke ukwuu.
Igbo 2006
Oké ákú-miri-ígwé, nke ra ka talent n'arọ́ n'otù, nēsi kwa n'elu-igwe ridata n'aru madu: madu we kwulu Chineke site n'ihe-otiti nke ákú-miri-ígwé ahu; n'ihi na ihe-otiti-ya di uku ri nne.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mkpụrụ mmiri nke ịdị arọ otu nʼime ha ruru kilogram iri anọ na ọkara, sitere nʼeluigwe na-adakwasị ndị mmadụ. Nke a mekwara ka ha kọchaa Chineke nʼihi ihe ntaramahụhụ nke mkpụrụ mmiri ahụ, nʼihi na ihe ntaramahụhụ ahụ dị nnọọ njọ nke ukwuu.