Revelation 16:9 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Okpomọkụ ahụ si nꞌanwụ bịa rere onye ọ bụla ọkụ nꞌahụ. Nke a mere ka ndị mmadụ bido ịkọcha aha Chineke, onye zidatara ihe otiti ndị a. Ma ihe otiti a emeghị ka ha chegharịa nꞌobi ha, o meghị ka ha bido inye Chineke otuto.
Igbo 2006
Ewe were oké okpom-ọku chab͕ue madu: ha we kwulu aha Chineke ahu Onye nwere ike ichi ihe-otiti ndia isi; ha echègharighi kwa inye Ya otuto.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Okpomọkụ ahụ si nʼanyanwụ bịa rere onye ọbụla ọkụ nʼahụ. Nke a mere ka ndị mmadụ bido ịkọcha aha Chineke, onye nwere ike ịchị ihe otiti ndị a, ma ha jụrụ ichegharị nye ya otuto.