Revelation 17:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Emesịa, otu nꞌime mmụọ ozi asaa ndị ahụ wụsara ihe dị nꞌefere ha nꞌelu ụwa bịara nꞌebe m nọ bido ịgwa m okwu. Ọ gwara m okwu sị, “Soro m ka anyị gaa, aga m egosi gị ihe ga-abịakwasị nwanyị ahụ ụwa nile maara dị ka akwụla, nwanyị ahụ na-anọkwasị nꞌelu ọtụtụ mmiri nke ụwa.
Igbo 2006
Otù mọ-ozi n'etiti ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere ọkwa asa ahu we bia, we kpayerem uka, si, Biari, m'gēgosi gi ikpé nke oké nwanyi ahu nākwa iko onye nānọkwasi n'ọtutu miri;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu nʼime ndị mmụọ ozi asaa ndị ahụ ji efere bịara sị m, “Bịa, aga m egosi gị ahụhụ ga-abịakwasị onye ahụ ụwa niile maara dịka akwụna, onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ọtụtụ mmiri nke ụwa.