Revelation 17:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe he kwekọtarịtara, ha ga-ebu agha megide Nwa atụrụ ahụ. Kama Nwa atụrụ ahụ ga-emeri ha nꞌihi na ọ bụ onyeisi nꞌebe ndị nile nwe mmadụ nọ. Ọ bụkwa eze ndị eze nile. Ndị ya bụkwa ndị a kpọrọ na ndị a họpụtara, na ndị kwesịkwara ntụkwasị obi.”
Igbo 2006
Ndia gēbu agha megide Nwa-aturu ahu, Nwa-aturu ahu gēmeri kwa ha, n'ihi na Ọ bu Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile, na Eze kachasi ndi-eze nile; ndi soro Ya gēmeri kwa, bú ndi akpọworo, ndi arọputawo-kwa-ra, ndi kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha ga-ebu agha megide Nwa Atụrụ ahụ, ma Nwa Atụrụ ahụ ga-emeri ha nʼihi na ọ bụ Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile nakwa Eze kachasị ndị eze niile. Ndị so ya bụkwa ndị a kpọrọ, na ndị a họpụtara, ndị ya kwesikwara ntụkwasị obi.”