Revelation 17:15 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mmụọ ozi ahụ gwakwara m okwu si, “Osimiri ndi a, na iyi ukwu na iyi nta ndị a nwanyị a na-anọkwasị nꞌelu ha nọchiri anya ndị mmadụ dị iche iche, ndị si nꞌebe nile dị iche iche ma mba dị iche iche nke ụwa.”
Igbo 2006
O we sim, Miri nile i huru, ebe nwanyi ahu onye nākwa iko nānọdu, bu ndi di iche iche, na ìgwè madu, na mba di iche iche, na asusu di iche iche.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ ọ sịrị m, “Mmiri ndị ahụ ị hụrụ, ebe nwanyị akwụna ahụ nọ, bụ ndị mmadụ dị iche iche, igwe mmadụ, na mba dị iche iche na nʼasụsụ dị iche iche.