Revelation 17:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Anụ ọhịa ahụ na-acha ọbara ọbara nke nwekwara mpi iri, nke mpi ndị a nọchiri anya ndị eze iri, ya na ndị eze a kpọrọ nwanyị a asị. Ha ga-agbakwa ya ọtọ, kwanyekwa ọkụ ga-erechapụ ya.
Igbo 2006
Mpi iri ahu i huru, ha na anu-ọhia ahu, ndia gākpọ nwanyi ahu nākwa iko asì, ha gēme kwa ya ka ọ buru onye tọb͕ọrọ n'efu buru kwa onye b͕a ọtọ, ha gēri kwa anu-aru-ya, rechapu kwa ya n'ọku.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anụ ọhịa ahụ na mpi iri ahụ ị hụrụ ga-akpọ nwanyị akwụna ahụ asị. Ha ga-agba ya ọtọ, laakwa ya nʼiyi, ha ga-eri anụ ya, werekwa ọkụ rechapụ ya.