Revelation 17:4 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nwanyị ahụ yi akwa na-acha odo odo na nke na-achakwa ọbara ọbara. Ọ gbakwa ihe ịchọ mma e ji ọlaedo na nkume dị oke ọnụ ahịa kpụọ. O jikwa iko ọlaedo nꞌaka ya nke jupụtara nꞌihe arụ na ihe ure nile o ji na-akwa iko ya.
Igbo 2006
Eb͕okwasiwo kwa nwanyi ahu ákwà ododo na ákwà uhie, ewerewo kwa ọla-edo na nkume di oké ọnu na pearl chọ ya nma, o nwe-kwa-ra ìko ọla-edo n'aka-ya nke juputara n'ihe-árú, bú ihe nile nādighi ọcha nke ikwa-iko-ya,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nwanyị ahụ yi akwa na-acha odo odo na nke na-achakwa ọbara ọbara, gbarakwa ihe ịchọ mma e ji ọlaedo, nkume dị oke ọnụahịa na pieal kpụọ. O jikwa iko ọlaedo nʼaka ya nke jupụtara nʼihe arụ na ihe ure niile o ji na-akwa iko ya.