Revelation 17:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Anụ ọhịa ahụ ị hụrụ nwere mgbe o ji dị ndụ ma ugbu a ọ dịkwaghị ndụ. Ma ọ ga-emesịa site nꞌolulu ahụ na-enweghị nsọtụ pụta. Ma ọbịbịa ya ga-ewetara ya nanị ịla nꞌiyi. Ma nlọghachi ya ga-eju ndị ahụ a na-edeghị aha ha nꞌime akwụkwọ ndụ ahụ na-adị tupuu e kee ụwa anya.
Igbo 2006
Anu-ọhia ahu nke i huru diri, ọ dighi kwa ub͕u a; ọ gaje kwa isi n'abyss ahu rigoputa, na ila n'iyì. Ọ gēju kwa ndi bi n'elu uwa anya, bú ndi anēdeghi aha-ha n'akwukwọ nke ndu ahu site n'oge itọ ntọ-ala uwa, mb͕e ha nēle anu-ọhia ahu anya, na ọ diri, ọ dighi kwa ub͕u a, ọ gābia kwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anụ ọhịa ahụ ị hụrụ, nwere mgbe ọ dịịrị, ma ugbu a, ọ dịkwaghị. Ma ọ ga-esi nʼolulu Abis ahụ pụta banye na mbibi. Ma nlọghachi ya ga-eju ndị ahụ a na-edeghị aha ha nʼime akwụkwọ ndụ ahụ site nʼoge e kere ụwa anya. Nʼihi na e nwere mgbe ọ dịịrị, ma ugbu a, ọ dịkwaghị, ma ọ ga-emesi bịa.