Revelation 17:9 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ugbu a okwu a dịrị ndị nwere amamihe. Isi asaa anụ ọhịa ahụ nwere nọchiri anya otu obodo e wuru nꞌelu ugwu nta asaa ebe nwanyị a bi.
Igbo 2006
N'ebe a ka uche nke nwere amam-ihe di. Isi asa ahu bu ugwu asa, nke nwanyi ahu nānọdu n'elu ha:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nke a chọrọ uche nke nwere amamihe. Isi asaa ahụ nọchiri anya ugwu asaa ahụ nke nwanyị ahụ na-anọdụ nʼelu ha. Ha na-anọchikwa anya ndị eze asaa.