Revelation 18:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ihe ndị a nile gasịrị, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ nke si nꞌeluigwe bịa nꞌụwa. E nyere mmụọ ozi a ike dị ukwuu. Ebube ya mekwara ka ìhè jupụta nꞌụwa.
Igbo 2006
Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu mọ-ozi ọzọ ka o nēsi nelu-igwe ridata, nēnwe ike uku; ewe site n'ebube-ya nye uwa ìhè.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ihe ndị a niile gasịrị, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼeluigwe na-arịdata. E nyere ya ikike dị ukwuu, ebube ya mekwara ka ihe jupụta nʼụwa.