Revelation 18:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na Babilọn a bụ nnọọ nnukwu obodo ebe a na-azụ ahia. Na Babilọn ka a na-azụ ọlaedo na ọlaọcha na nkume dị oke ọnụ ahia, na ọla, na ezi akwa rekereke, na akwa na-acha uhie uhie, na akwa dị ezi ọcha, na osisi ọ bụla na-esi isi ụtọ, ya na ihe nile ọ bụla e ji mpi enyi mee, na ihe nile ọ bụla e ji osisi pịa, ma ọ bụ ọla e ji igwe dị iche iche kpụọ, ma ọ bụ nkume.
Igbo 2006
ihe-ahia ọla-edo, na ọla-ọcha, na nkume di oké ọnu-ahia, na pearl, na ezi ákwà ọcha, na ákwà ododo, na nkisi, na ákwà uhie; na osisi nile ọ bula nēsì ísì utọ, na ihe nile ọ bula eji ọdu me, na ihe nile ọ bula eji osisi dikarisiri oké ọnu-ahia, ma-ọbu ọla, ma-ọbu ígwè, ma-ọbu marble, me;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ngwa ahịa ọlaedo gị, na ọlaọcha, na ọla e ji achọ mma na nkume oke ọnụahịa, ezi akwa ọcha, na akwa uhie uhie, na akwa lọrịlọrị, na akwa odo odo, osisi niile na-esi isi ọma, ihe niile e ji ọdụ enyi mee, ngwa ahịa niile e ji osisi niile dị oke ọnụahịa mee, bronz, igwe na nkume mabụl.