Revelation 18:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ha na ụda dị iche iche na mmanụ otite dị iche iche, na ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ, a na-akpọ frankinsensi, na mmanya na mmanụ olivu, na ụtụ ọka na ọka, na anụ ụlọ, na atụrụ, na inyinya na ụgbọ ala, na ndị ohu, na mkpụrụ obi mmadụ.
Igbo 2006
na cinnamon, na amomum, na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na manu-otite, na frankincense, na manya-vine, na manu, na utu ọkà, na ọka, na anu-ulo, na aturu; na ihe-ahia nke bu inyinya na ub͕ọ-ala na aru madu; na nkpuru-obi madu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha na ụda sinamọn na mmanụ otite nke ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ, máá na frankisens, mmanya na mmanụ oliv, ụtụ ọka na wiiti, ehi na atụrụ, ịnyịnya na ụgbọala agha, na ndị na-ere mmadụ ibe ha dịka ohu, na ahụ mmadụ na mkpụrụobi mmadụ.