Revelation 18:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ndị ahụ nọ na-ele Babilọn anya, ndị hụrụ ihe ndị a anya, kwakwara akwa sị, “Ihe ọma ahụ nile ị hụrụ nꞌanya agabigala. Ihe ọma nile i ji ebi ndụ, na ihe oke ọnụ ahia nile i ji azụ afọ gị, agaghị abụkwa nke gị! Lee ka ha si laa ruo mgbe ebighị ebi!”
Igbo 2006
Nkpuru-osisi nile nke nāgu nkpuru-obi-gi apuwo n'ebe i nọ, ihe nile nātọ utọ nke ma-kwa-ra nma apuwo kwa n'aka-gi la n'iyì, madu agaghi-ahu kwa ha ọzọ ma-ọli.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ha ga-asị, ‘Mkpụrụ ndị ahụ niile nke na-agụ mkpụrụobi agụ e sitela nʼebe ị nọ gabiga. Ihe ọma niile i ji ebi ndụ, na ihe oke ọnụahịa niile i ji azụ afọ gị, efunarịla gị. Apụghị ịchọtakwa ha ọzọ mgbe ọbụla.’