Revelation 18:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ya mere, ndị ahia ahụ ghọrọ ọgaranya site nꞌiresi ndị obodo Babilọn ahia ga-eguzo nꞌebe dị anya na-atụ egwu ihe ga-eme ha onwe ha, ma na-akwa akwa na-etikwa mkpu na-asị,
Igbo 2006
Ndi-ahia ndi nāzu ihe ndia, ndi gburugburu ọgaranya site na ya, ha gēguzo n'ebe di anya n'ihi egwu nke nmekpa-aru-ya, nākwa ákwá, nēru kwa újú;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị ahịa ahụ bara ọgaranya site nʼaka ya, ga-anọ nʼebe dị anya, nʼihi oke egwu nke ntaramahụhụ ya, na-eru ụjụ, na-ebesikwa akwa ike.