Revelation 18:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Ewoo! obodo ukwu ahụ mara mma dị ka nwanyị yi uwe na-acha odo odo na uhie uhie, nke nya ihe olu e ji ọlaedo na nkume dị oke ọnụ ahia mee, na nke gbakwa mgba nꞌaka e ji nkume dị oke ọnụ ahia kpụọ,
Igbo 2006
nāsi, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, nke eb͕okwasiworo ya ezi ákwà ọcha na ákwà nācha ọbara-ọbara na ákwà uhie, nke ewerewo-kwa-ra ọla-edo na nkume di oké ọnu-ahia na pearl ke ya!
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu ahụ, nke e yikwasịrị ezi akwa ọcha, nke na-acha odo odo na ọbara ọbara nke nya ihe ịchọ mma nke ọlaedo, nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche na nkume pieal dị iche iche.