Revelation 18:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ha ga-ekpokwasị aja nꞌisi igosi obi ọjọọ ha na-eti mkpu akwa na-asị, “Ewoo! Ewoo! Leenụ ka obodo a si laa nꞌiyi o! Obodo ukwu ahụ mere anyị ka anyị bụrụ ndị ọgaranya site nꞌakụ dị nꞌime ya. Ma ugbu a nꞌotu ntabi anya, ihe nile dị nꞌime ya erechapụla ọkụ!”
Igbo 2006
Ha we kpokwasi ájá n'isi-ha, ti kwa nkpu, nākwa ákwá, nēru kwa újú, si, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, nke ndi nile ndi nwere ub͕ọ-ha n'oké osimiri buru ọgaranya nime ya site n'ibi-obi-ya di oké ọnu-ahia! n'ihi na n'otù oge hour ka emere ka ọ tọb͕ọ n'efu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha ga-ekpokwasị aja nʼisi igosi obi ọjọọ ha na-eti mkpu akwa na-asị, “ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu a maara aha ya ebe ndị niile nwere ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri ghọrọ ndị ọgaranya site nʼakụ dị nʼime ya. Ma ugbu a, nʼotu ntabi anya, ihe niile dị nʼime ya bụ ihe a laara nʼiyi.’