Revelation 18:22 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ dịghị mgbe ọzọ ụzụ egwu ga-adị nꞌebe ahụ. A gaghị anụkwa olu oja, na une, na ụbọ akwara na ndị na-akpọ ha. A gaghị ahụkwa ndị nka ọ bụla nꞌime ya. A gaghị ahụkwa ndị na-akwọ ọka ma ọ bụ igwe e ji akwọ ọka nꞌime ya.
Igbo 2006
Agaghi-anu kwa olu ndi nākpọ ubọ-akwara na ndi nākpọ ubọ ọzọ na ndi nēb͕u ọ̀jà na ndi nāfù opì nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-ahu kwa onye-ọ̀kà ọ bula, nke nēme ǹkà ọ bula, nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-anu kwa olu nke nkume-igwe-nri nime gi ọzọ ma-ọli;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ dịghị mgbe ọzọ ụzụ egwu ga-adị nʼebe ahụ. Agaghị anụkwa olu ọja na une na ụbọ akwara na nke ndị na-afụ opi ike nʼime gị ọzọ. Aghaghị ahụ onye ọrụ ǹka ọbụla nʼime gị ọzọ. Agaghị anụkwa ụzụ nkume igwe nri nʼime gị ọzọ.