Revelation 18:23 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Abalị nile ga-abụkwa nanị oge ọchịchịrị nꞌihi na a gaghị ahụ, ọ bụladị otu oriọna nꞌime ya. Ọṅụ nke oriri ọlụlụ di na nwụnye agaghị adịkwa ọzọ. Olu obi ụtọ nke nwoke na nwanyị na-alụ di na nwụnye agaghị adịkwa. Nꞌụwa nile ka a maara ndị ahia nile si nꞌobodo a, ọ bụkwa mgbaasị ya ka o ji ghọgbuo mba nile nke ụwa.
Igbo 2006
ìhè nke oriọna agaghi-enwu kwa nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-anu kwa olu nke onye nālu nwunye ọhu na nke nwanyi anālu ọhu nime gi ọzọ ma-ọli: n'ihi na ndi-ahia-gi buri ndi-amadi nke uwa; n'ihi na ewere igwọ-nsi-gi duhie mba nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ìhè nke sitere nʼoriọna agaghị acha nʼime gị ọzọ. Olu obi ụtọ nke nwoke na nwanyị na-alụ di na nwunye agaghị adịkwa. Ndị mgbereahịa gị bụ ndị a ma ama nʼelu ụwa, ọ bụkwa mgbaasị gị ka e ji duhie mba niile nke ụwa.