Revelation 18:4 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ anụkwara m olu ọzọ si nꞌeluigwe na-akpọ oku na-asị, “Ndị m, sitenụ nꞌobodo ahụ pụta, unu esola ya keta oke na mmehie ya, nꞌihi na a ghaghị ịta unu ahụhụ ma unu soro ya mehie.
Igbo 2006
M'we nu olu ọzọ ka o nēsi n'elu-igwe dà, si, Ndi nkem, sinu nime ya puta, ka unu we ghara iso ya nwekọ nmehie-ya nile, ghara kwa inata ufọdu nime ihe-otiti-ya nile:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, anụkwara m olu ọzọ si nʼeluigwe na-akpọ oku na-asị, “ ‘Ndị m, sinụ nʼime ya pụta,’ ka unu ghara iketa oke na mmehie ya, ka unu gharakwa iketa oke ahụhụ ya.