Revelation 18:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
O biela ndụ ime onwe ya obi ụtọ, na inwezu ihe nile gụrụ ya agụụ, mee ka ọnọdụ ya ugbu a bụrụ nanị iru uju na ahụ mgbakasị. Ọ na-anya isi na-asị, ‘Abụ m eze nwanyị nọ nꞌelu ocheeze m. Abụghị m nwanyị ihe ọ bụla kọrọ, dị ka nwanyị di ya nwụrụ, iru uju ọ bụla adịghị nye m.’
Igbo 2006
Ka ha ra, bú otuto o nyere onwe-ya, na inupu-isi ọ nupuru, nyenu ya nmekpa-aru na iru-újú ra otú ahu: n'ihi na ọ nāsi n'obi-ya, Anamanọdu dika eze-nwanyi, abughikwa m nwanyi di-ya nwuru, ọ dighi kwa iru-újú m'gāhu ma-ọli.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nye ya ọtụtụ mmekpa ahụ na obi ilu dịka ndụ otuto, nʼime onwe ya obi ụtọ nke o nyere onwe ya. Ọ na-ekwu nʼobi ya na-asị, ‘Abụ m eze nwanyị nọ nʼelu ocheeze m. Abụghị m nwanyị di ya nwụrụ, iru ụjụ ọbụla adịghị nye m.’