Revelation 19:10 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ọ gwasịrị m okwu a, adara m nꞌala nꞌụkwụ ya ịkpọ isi ala nye ya, ma ọ gwara m sị, “O kwesịghị ka ị kpọọ isi ala nye m nꞌihi na abụ m nanị onyeozi Chineke dị ka gị onwe gị, na dị ka ọtụtụ ụmụnna gị ndị na-agba ama banyere okwukwe ha nwere nꞌime Jisọs. Ọ bụ nanị Chineke ka i kwesịrị ịkpọ isi ala nye. Nꞌihi na isi amụma nile na isi ihe ndị a nile m ziri gị bụ ịgwa gị ihe banyere Jisọs.”
Igbo 2006
M'we da n'ala n'iru ukwu-ya ikpọ isi ala nye ya. O we sim, Lezi anya ka i ghara ime ya: abum orù-ibe-gi, buru kwa orù-ibe nke umu-nna-gi nke nwere àmà nke Jisus: kpọ isi ala nye Chineke: n'ihi na àmà nke Jisus bu mọ nke amuma.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Adara m nʼala nʼụkwụ ya ịkpọ isiala nye ya, ma ọ gwara m sị, “O kwesighị ka ị kpọọ isiala nye m nʼihi na abụ m naanị onyeozi ibe gị, na dịka ọtụtụ ụmụnna gị ndị na-agba ama banyere Jisọs. Ọ bụ naanị Chineke ka i kwesiri ịkpọ isiala nye. Nʼihi na ọ bụ Mmụọ nke amụma na-agba ama ihe banyere Jisọs.”